Agradecimento a Deus
Agradecer a Deus é louvor, adoração e reconhecimento da sua soberania. Dai graças ao Senhor porque Ele é bom — a sua misericórdia dura para sempre!
Ka anyị jiri ekele bịakwute ya
jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
Toonu Onyenwe anyị.
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ị bụ Chineke m, aga m eto gị;
ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu.
Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ;
jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,
jirikwa ekele bulie ya elu.
Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,
aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele
na-etokwa aha gị dị ebube.
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.
Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị. Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.
Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya.
Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba. Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ. Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.
Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. Ha niile riri rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.