Ajuda
Deus é nosso auxílio e socorro em todo tempo. Ele não dorme nem cochila. O Senhor é nosso ajudador — não precisamos temer o que o homem possa nos fazer.
Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,
onye kere eluigwe na ụwa bịa.
Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;
onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;
ọ bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.
Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha
ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume,
nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.
Bịa ọsịịsọ inyere m aka
Onyenwe m na Onye nzọpụta m.
Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
nʼihi ebube nke aha gị;
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile
nʼihi aha gị.
Toonu Onyenwe anyị,
nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.
Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,
aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka,
agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.
Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ejidesi aka nri gị ike
bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;
aga m enyere gị aka.’
Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.