Publicidade

Ajuda

Por Bíblia Online

Deus é nosso auxílio e socorro em todo tempo. Ele não dorme nem cochila. O Senhor é nosso ajudador — não precisamos temer o que o homem possa nos fazer.

Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,

onye kere eluigwe na ụwa bịa.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;

onyenwe m bụ onye na-agba m ume.

Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;

bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.

Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha

ma na-azọpụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume,

nʼihi na ha mere ya ebe mgbaba ha.

Bịa ọsịịsọ inyere m aka

Onyenwe m na Onye nzọpụta m.

Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,

nʼihi ebube nke aha gị;

napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile

nʼihi aha gị.

Toonu Onyenwe anyị,

nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;

ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.

Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,

aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka,

agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.

Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,

onye na-ejidesi aka nri gị ike

bụ onye na-asị gị, Atụla egwu;

aga m enyere gị aka.

na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.

"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.

Aga m arịọ Nna m, ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.

Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.

Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,

adaberekwala na nghọta gị.

Nʼihe ọbụla na-eme, ka Chineke bute ụzọ,

ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.

Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-