Aniversário de criança
O aniversário de uma criança é momento de celebrar o presente precioso que Deus deu. Cada criança é formada e conhecida por Deus desde antes de nascer.
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị
tupu otu nʼime ha adịrị.
Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!
Leekwa ka ha si dị ukwuu.
Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,
ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;
gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
Aga m anọgide na-eto gị.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.
Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.
Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.
Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,
mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
ọ ziri m ihe, sịkwa m,
"Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,
debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
Ndụmọdụ ikpeazụ
Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ!
Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.