Publicidade

Anjos

Por Bíblia Online

Os anjos são seres celestiais criados por Deus para servir, adorar e executar seus propósitos. A Bíblia revela anjos mensageiros, guerreiros e protetores ao longo de toda a história redentora.

Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.

Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, "Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ. nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe tọgbọburu.

I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?

Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, "Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. Ma lee ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. ga-akpọkwa aha ya Jisọs.

Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, "Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile.

"Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe.

Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma."

Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị."

Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. Ha sịrị, "Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe."

Ihe ga-atọ Chineke ụtọ

Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide. Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.

Ịhụnanya

A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.

Karịchasịa nke a, bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite:

pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ,

Mmụọ Nsọ gosiri na bụ onye ezi omume,

ndị mmụọ ozi hụrụ ya,

e kwusara ihe banyere ya nye mba niile,

ụwa niile kwenyeere na ya,

a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.

Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile.

Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-