Publicidade

Aprender

Por Bíblia Online

Aprender é vocação do discípulo. Jesus disse: aprendei de mim. A Bíblia convida a aprender com humildade, perseverança e disposição — sentados aos pés do Mestre.

Aprender de Jesus

Tomai sobre vós o meu jugo e aprendei de mim. O Espírito Santo nos ensinará todas as coisas e nos recordará tudo.

Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ."

Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge."

Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.

Jisọs zara ha, "Ozizi m abụghị nke m, kama bụ nke onye ahụ zitere m.

Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.

Ensino e sabedoria

O temor do Senhor é o princípio do saber. A disciplina do Senhor forma o caráter e abre caminhos de entendimento.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.

bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.

Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,

ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.

Nʼihi na bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka na-abara mba,

dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.

M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,

duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.

Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,

ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.

Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị.

Comunidade de aprendizado

Ensinem e aconselhem-se mutuamente. A igreja é escola de Cristo — onde todos ensinam e todos aprendem juntos.

Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.

Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.

Ezi ozizi na ezi agwa

Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.

Ouvir e praticar

Ensina-me a fazer a tua vontade. Guia-me pela tua verdade. O verdadeiro aprendiz pratica o que ouviu do Mestre.

Kuziere m ime uche gị,

nʼihi na bụ Chineke m;

ka ezi Mmụọ gị

duo m nʼala dị larịị.

O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,

kuzikwaara m ụzọ gị niile.

Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,

nʼihi na bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,

olileanya m dị na gị.

Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;

bụ ya mere na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.

na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,

na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

Aga m eme ka nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;

Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.

Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,

nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,

nʼihi na bụ naanị mgbe bịara kpee ụwa ikpe

ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-