Pular para o conteúdo
Publicidade

Colheita

Por Bíblia Online

A colheita é princípio bíblico universal: colhemos o que semeamos. Quem semeia na fé e obediência colherá bênçãos abundantes do Senhor.

Semear e colher

Quem semeia no Espírito, do Espírito colherá vida eterna. Não nos cansemos de fazer o bem — ao tempo certo colheremos.

bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi.

Unu ekwela ka e duhie unu, nʼihi na mmadụ ọbụla apụghị ịkwa Chineke emo. Mkpụrụ ọbụla mmadụ kụrụ ka na-aghọrọ.

Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma bụrụ na anyị adaghị mba.

Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ga-eri, ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.

Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.

Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.

Fidelidade na semeadura

Honra ao Senhor com as tuas primícias. O Senhor abrirá as janelas do céu e derramará bênção sem medida.

Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,

na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.

Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m," ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

" bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile, aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile.

Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?

Osisi vaịnị anwụọla.

Osisi fiig akpọnwụọla.

Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla.

Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla.

Nʼebe ndị mmadụ nọ,

ọṅụ alala.

A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,

na dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,

a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata

na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,

a sịkwa na dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,

na dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,

mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.

Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.

Seja o primeiro