Compaixão
A compaixão é o coração de Deus em ação. Ele é compassivo e misericordioso, tardio em irar-se e grande em amor. Somos chamados a refletir essa compaixão no mundo.
Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,
otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
"Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara,
hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya?
Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ,
ma agaghị m echezọ unu.
Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m,
nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
ka o gosi unu ịhụnanya ya.
O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Onye bụ chi ahụ dịka gị,
nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie
nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?
Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,
kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
"Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike,
zọpụtakwa ụlọ Josef.
Aga m eme ka ha lọghachita,
nʼihi na aga m egosi ha obi ebere.
Ha ga-adị
ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha,
aga m azakwa arịrịọ ha.
"Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi, meerenụ ibe unu ebere, ma gosikwa ibe unu ọmịiko. Unu emegbula ụmụ nwanyị di ha nwụrụ maọbụ nwa na-enweghị nne na nna maọbụ ndị ọbịa maọbụ ndị ogbenye. Unu echela echiche ọjọọ nʼobi unu megide ibe unu.’
Ịpụta ihe nke ndụ ọhụrụ ahụ
Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.
Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
Ịhụ ahụhụ nʼihi ime ihe dị mma
Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya?
Ekele dịrị Chineke onye nkasiobi
Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.
Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.
Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.
Ekele mmechi
Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.