Pular para o conteúdo
Publicidade

Compreensão

Por Bíblia Online

A verdadeira compreensão vem de Deus. Os caminhos do Senhor são mais altos que os nossos. Mas Ele nos convida a buscar entendimento — e promete iluminar quem o busca de coração.

A sabedoria de Deus

Os meus pensamentos não são os vossos pensamentos. A incompreensibilidade de Deus nos leva à humildade e adoração.

"Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,

otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,

otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.

"Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,

mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju

nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.

Ụrọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,

Gịnị ka i ji m akpụ?

Ka ọrụ gị ga-asị,

Lee, dịghị aka abụọ o nwere?

bụ na matabeghị?

ga-abụ na nụbeghị ya?

Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,

Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.

naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.

O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.

Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.

Tupu e kee ugwu niile,

na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa,

siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, bụ Chineke.

Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị;

ha dịka ụnyaahụ gafere agafe

maọbụ ka otu awa nke anyasị.

Ekele dịrị Chineke

Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu!

Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile,

ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.

Buscar entendimento

Clama a mim e responder-te-ei. A sabedoria é a coisa principal — busque o entendimento com todo o coração.

Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke na-amaghị.

Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,

ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.

Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta,

ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.

Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;

maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.

Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya,

ma Onyenwe anyị bụ onye na-eleba anya nʼechiche obi anyị niile.

Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye bụ,

Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma.

Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Iluminação divina

A entrada da tua Palavra dá luz e entendimento. Deus revela verdades ocultas e transforma nossa visão da realidade.

Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;

na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

Aga m eme ka nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;

Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.

Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga

maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,

otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,

onye mere ihe niile.

Jisọs zara sị ya, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, pụghị ịhụ alaeze Chineke anya."

Jisọs legidere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ."

nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, "bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi."

E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.

Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.

bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị.

Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Ka onye ọbụla hapụ sị, mgbe a na-anwa ya, "bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a." Nʼihi na dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.

Seja o primeiro