Comunidade
A comunidade cristã é essencial para o crescimento da fé. A Bíblia ensina que fomos criados para viver em comunhão — edificando-nos, encorajando-nos e servindo uns aos outros.
Viver em unidade
Os que creram eram um coração e uma alma. A comunidade primitiva partilhava tudo e vivia em harmonia e alegria.
Ndị kwere ekwe na-ekekọrịta ihe
Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
Nnọkọ nke ndị kwere ekwe
Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.
Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele. Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.
Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya.
Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke.
Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha."
Edificação mútua
Vivam em harmonia uns com os outros. Não haja divisões entre vós. A comunidade cresce quando cada membro contribui.
Ịkpa iche iche dị na Chọọchị
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.
Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.
Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.
Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
Ndị dị ike na ndị dara mba
Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi.
Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere.
Ịdọ aka na ntị ikpeazụ
Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.
Amor e compromisso
Não deixemos de congregar. O vínculo perfeito é o amor — ele une a comunidade e produz frutos que duram.
Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ. Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.
Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ.
Ngọzị nke ibi nʼotu
Lee ka o si bụrụ ihe dị mma
na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!
Ịhụ ahụhụ nʼihi ime ihe dị mma
Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.
Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.
E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu.
Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m."