Consolo
O consolo de Deus é bálsamo para a alma ferida. Ele nos conforta em todas as tribulações para que possamos consolar outros com o mesmo consolo divino.
Deus consola
Ainda que eu ande pelo vale da sombra da morte, não temerei mal algum. O Senhor consola, guia e está sempre presente.
A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:
nkwa gị na-echebe ndụ m.
Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi,
dịka nkwa i kwere ohu gị si dị.
Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya,
e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
Confiança na aflição
Eu sei que o meu Redentor vive. Deus é força e escudo — mesmo na tribulação, Ele nos sustenta e consola.
Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,
amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.
Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,
ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta."
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba."
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga."
Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo,
"Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?"
Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ,
nʼihi na a ga-akasị ha obi.
Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya.
Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m.
Chineke m ga-anụ olu m.
Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.