Conversão
A conversão é o ato de se voltar para Deus — arrependendo-se do pecado e abraçando a graça. É o início de uma vida nova, transformada pelo amor de Cristo.
Arrependei-vos
Arrependei-vos e convertei-vos para que os vossos pecados sejam apagados. A conversão começa com a mudança de mente e coração.
Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
Ma Pita sịrị ha, "Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.
Site nʼoge ahụ gaa nʼihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, "Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso."
Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu.
Ọ sịrị, "Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma."
O amor de Deus converte
Céu se alegra por um pecador que se arrepende. Deus não deseja a morte do ímpio, mas que se converta e viva.
Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa.
Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị."
Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa."
Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!
"Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ.
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, sị, "Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel?
" ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha,
eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’
"Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel. Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.
"Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume
nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri
maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị,
onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya,
maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.
Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,
kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,
ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.
Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,
ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.
Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,
na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.
Ọ na-edebezu iwu m niile,
na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi.
Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ;
ọ ghaghị ịdịkwa ndụ,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
"Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche, ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:
"Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,
na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;
Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.
Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.
Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.
Ọ na-efe arụsị,
na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.
Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.
O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.
"Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.
"Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu
maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.
Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.
Ọ dịghị emegbu onye ọbụla,
maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ.
Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;
ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla,
na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego,
na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile.
Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ. Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.
"Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ. Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.
"Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere. Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ?
"Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ.
"Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ. Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya. Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ. Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?
"Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ. Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ? Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!
Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
Transformação
Voltai-vos para mim e sereis salvos! Rasgai o coração e não as vestes. A verdadeira conversão transforma o interior.
Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,
ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.
Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,
ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii,
hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ.
Lọghachikwute m,
nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị."
"Ọ bụladị ugbu a," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
"Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.
Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m."
Dọwakwaanụ obi unu,
ọ bụghị uwe unu.
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere.
Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya.
Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.
ọ bụrụ na ndị m ndị a kpọkwasịrị aha m, ewedata onwe ha nʼala, kpee ekpere, chọsie ihu m ike, sitekwa na mmehie ha chigharịa, aga m esite nʼeluigwe za ekpere ha, gbaghara ha mmehie ha, mee ka ala ha dịrị ndu.
Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ. Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem. Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a. Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si:
"Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị. Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya. Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ. Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya."
Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo. Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem. Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko. Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, "Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị." Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ. Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ. Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa. Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem. Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.
Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị,
"Onyenwe anyị were oke iwe megide nna unu ha. Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ?
"Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ "
Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nke ọnwa iri na otu, bụ ọnwa Shebat, nʼafọ abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya onye amụma, bụ nwa Berekaya, nwa Ido ntị, na-asị:
Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.
Ajụrụ m, "Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?"
Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, "Aga m egosi gị ihe ha bụ."
Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, "Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile."
Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, "Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ."
Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, "Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?" Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche.
Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, "Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ, ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’
"Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
"Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ. Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ "
Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ. Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, "Gịnị ka ihe ndị a bụ?"
Ọ sịrị m, "Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem."
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ. Asịrị m, "Gịnị ka ndị na-abịa ime?"
Ọ zaghachiri m, "Ndị a bụ mpi anọ ndị ahụ chụsasịrị Juda, ime ka onye ọbụla ghara inwe ike iwelite isi ya. Ma ndị a abịala imenye ha ụjọ, na ịtụda mpi mba niile, bụ ndị ahụ buliri mpi ha imegide ala Juda, na ịchụsa ndị ya."
Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa.
Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).
Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.