Publicidade

Coração puro

Por Bíblia Online

Bem-aventurados os puros de coração, porque verão a Deus. A pureza de coração é alvo, privilégio e busca constante do cristão que deseja contemplar a face do Senhor.

Coração puro

Bem-aventurados os puros de coração. A pureza interior precede toda transformação externa e abre os olhos para ver a Deus.

Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi,

nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya.

Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị?

Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?

bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha,

onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị,

maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.

Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị,

natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.

Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,

hichapụkwa mmehie m niile.

Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

Achụpụla m nʼihu gị,

anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.

Ọgwụgwụ nke ndị na-emebi iwu

Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,

dịkwara ndị obi ha dị ọcha.

Purificar-se

Todo o que tem essa esperança em Cristo se purifica. O amor procede de coração puro, boa consciência e fé sincera.

Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.

Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka dị. Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.

Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị.

Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.

Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.

Nʼihe ọbụla unu na-eme, wezuganụ ntamu na ịrụ ụka nʼetiti unu. Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nʼime ụwa ọjọọ a, nʼetiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, na nʼetiti ndị nwere obi nʼazụ. Mgbe ahụ, unu ga-enwupụta nʼetiti ha dị ka kpakpando nʼime ụwa! Na-echekwanụ nʼihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nʼihi na ọrụ m rụrụ nʼetiti unu abụghị ihe efu.

Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe dị ukwuu.

Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,

ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-