Publicidade

Coração

Por Bíblia Online

O coração é o centro do ser humano — sede dos pensamentos, emoções e decisões. A Bíblia ensina a guardar, purificar e render o coração a Deus como oferta viva.

Guardar o coração

Sobre tudo o que se deve guardar, guarda o teu coração, porque dele procedem as fontes da vida e de toda decisão.

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,

adaberekwala na nghọta gị.

Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,

adaberekwala na nghọta gị.

Nʼihe ọbụla na-eme, ka Chineke bute ụzọ,

ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.

Amamihe na-eweta ahụ ike

Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.

Ma debe iwu m nʼobi gị.

Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,

wetakwara gị udo na ọganihu.

Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị,

kekwasị ha nʼolu gị,

deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.

Mgbe ahụ, ga-enwe ihuọma na ezi aha

nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.

Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo;

ekworo na-eme ka o ree ure.

Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,

ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.

Coração puro

Cria em mim um coração puro, ó Deus. Ensina-me a contar meus dias para que tenha um coração sábio.

Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,

ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.

Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m,

ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile,

bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke na-anabata.

Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,

unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.

Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.

ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.

Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,

mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya

ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike.

Aga m eji obi ziri ezi too gị

dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.

Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

Buscar a Deus de coração

Amarás ao Senhor teu Deus de todo o coração. A busca sincera leva ao encontro; o coração dividido leva à ruína.

zara sị ya, " Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.

zara sị ya, " Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.

Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

Nʼezie agwa m unu, bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ kwuru ga-emezukwa.

Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,

o nwekwaghị ngwọta.

Onye pụrụ ịghọta ya?

Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,

o nwekwaghị ngwọta.

Onye pụrụ ịghọta ya?

"Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,

na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,

nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,

na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya."

Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.

Ma lezienụ anya nke ọma idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu: nke bụ ịhụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, ịga ije nʼirube isi nye ya, irube isi nʼiwu ya niile, ịdabere na ya, na iji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile fee ya ofufe."

Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.

Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.

Conhecer o coração

O homem olha para a aparência, mas o Senhor olha para o coração. Deus conhece os segredos mais profundos.

Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, "Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi."

Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, "Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi."

Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri

otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.

Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,

ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.

Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,

ga-eme ka ha gaa nʼihu.

Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.

Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.

Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.

Ka mee ka obi unu guzosie ike nʼịdị nsọ, na-enweghị ịta ụta ọbụla, nʼihu Chineke na Nna anyị, nʼọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị nsọ ya niile.

unu emela ka obi unu sie ike,

dị ka unu mere nʼoge nnupu isi

mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-