Publicidade

Dar

Por Bíblia Online

Dar é princípio do Reino de Deus. Jesus deu tudo — até a própria vida. A Bíblia nos ensina que é mais bem-aventurado dar do que receber, e que Deus ama ao que dá com alegria.

Dar com alegria

Deus ama ao que dá com alegria. Dai e dar-se-vos-á. O generoso prospera e quem abençoa será abençoado.

Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.

Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.

Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ga-eri, ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.

ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.

Nʼihi na bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, bụghị ihe na-enweghị ike inye.

Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị."

Princípios de generosidade

Honra ao Senhor com as tuas primícias. Não negues o bem a quem o merece. A alma generosa prosperará.

Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,

na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.

Ejigidele ihe ọma pụrụ imere onye ọzọ

mgbe dị gị nʼaka ime ya.

E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;

onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.

Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara,

na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.

Kwa ụbọchị ka na-achọ inwe karịa,

ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.

Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi.

Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.

Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m," ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

O ensino de Jesus

Quando deres esmola, não toque a trombeta. A generosidade do coração importa mais que a grandeza do donativo.

"Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.

Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.

Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.

Jisọs zara sị ya, "bụrụ na chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m."

Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.

Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.

ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.

Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,

ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.

"Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.

Nehemaya gwakwara ha sị; "Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu."

A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-