Tomar uma decisão
Tomar decisões com sabedoria é um dos maiores desafios da vida. A Bíblia nos ensina a buscar a Deus em oração, na Palavra e no conselho, confiando que Ele dirige os nossos passos.
Buscar a Deus
Se algum de vós tem falta de sabedoria, peça a Deus. Ele dá generosamente e sem repreensão a todos os que pedem.
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.
Conselho e direção
Onde não há conselho os planos se frustam. Toda Escritura é útil para nos guiar nas decisões da vida.
Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.
A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,
maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya,
na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ.
Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata,
otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi,
ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ,
si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu,
ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu,
egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
Onye dị umengwụ nʼọrụ ya
bụ nwanne nke onye mbibi.
Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,
ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga,
ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị
bụ enweghị uche na ihe ihere.
Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa,
ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:
ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
Mgbe ha ruru nʼakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nʼakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ nke Jisọs akwagideghị ka ha gaa.
Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl. Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, "Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha." Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.
Confiar e seguir
Seja o que for que façais, fazei tudo para a glória de Deus. O sábio ouve a Deus antes de agir.
Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.
Na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, "Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị."
Solomọn zara sị, "I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.
"Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa. Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke. Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?"
Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a. Ya mere, Chineke zara sị ya, "Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị. Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị.
Nwunye ya sịrị ya, "Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ."
Ma ọ zara, "Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?"
Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.