Deus é amor
Deus é amor — esta é a declaração mais profunda da Bíblia sobre a natureza divina. Tudo que Deus faz nasce do amor. Quem permanece no amor permanece em Deus.
A natureza de Deus
Deus é amor. Quem permanece no amor, permanece em Deus e Deus nele. Ele nos amou primeiro com amor eterno.
Chineke bụ ịhụnanya
Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke. Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.
Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ.
Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.
Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
O amor de Deus revelado
Deus prova o seu amor em que Cristo morreu por nós quando ainda éramos pecadores. Seu amor é compassivo e eterno.
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.
Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!
Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Abụ ekele
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Onye bụ chi ahụ dịka gị,
nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie
nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?
Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,
kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
Ekele mmechi
Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.