Pular para o conteúdo
Publicidade

Deus é amor

Por Bíblia Online

Deus é amor — esta é a declaração mais profunda da Bíblia sobre a natureza divina. Tudo que Deus faz nasce do amor. Quem permanece no amor permanece em Deus.

A natureza de Deus

Deus é amor. Quem permanece no amor, permanece em Deus e Deus nele. Ele nos amou primeiro com amor eterno.

Chineke bụ ịhụnanya

Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, makwara Chineke. Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.

Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.

Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ.

Chineke bụ ịhụnanya. Onye bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.

Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

O amor de Deus revelado

Deus prova o seu amor em que Cristo morreu por nós quando ainda éramos pecadores. Seu amor é compassivo e eterno.

Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.

Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.

Ma gị, Onyenwe anyị, bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,

iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke!

Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.

Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,

aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

Abụ ekele

Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na dị mma.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Onye bụ chi ahụ dịka gị,

nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie

nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?

naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,

kama bụ onye na-atọ ụtọ inwe obi ebere.

Ekele mmechi

Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.

Seja o primeiro