Dia das crianças
As crianças são preciosas aos olhos de Deus. Jesus as acolheu, abençoou e ensinou que delas é o Reino dos Céus — modelos de fé, pureza e humildade.
Jesus e as crianças
Deixai vir a mim as crianças. Jesus abraçou, abençoou e honrou as crianças como modelo de fé para os adultos.
Ma Jisọs sịrị ha, "Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a."
Onye dịkarịrị ukwuu
Nʼoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ajụjụ sị, "Olee onye dị ukwuu karịa ibe ya nʼalaeze eluigwe?"
Ọ kpọrọ otu nwantakịrị, onye o mere ka o guzoro nʼetiti ha, ọ sịrị, "Nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị ma dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba nʼalaeze eluigwe. Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
Atụrụ furu efu
"Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile.
Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, "Hozanna dịrị Nwa Devid." Iwe were ha nke ukwuu.
Ha sịrị ya, "Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?"
Jisọs zara sị ha, "E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị,
" ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara
gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ ?"
Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla nke na-agaghị anabata alaeze Chineke dị ka nwantakịrị agaghị aba nʼime ya." Mgbe ahụ, o kuuru ha nʼaka ya, bikwasị ha aka ya abụọ ma gọzie ha.
Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzoro nʼetiti ha. O kuuru nwata ahụ nʼaka ya sị ha, "Onye ọbụla nabatara otu nʼime ụmụntakịrị ndị a nʼaha m, na-anabata m. Ma onye ọbụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata onye zitere m."
Instruir e proteger
Instrui a criança no caminho de Deus. Elas são herança do Senhor — presentes sagrados que devemos educar com amor.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.
Udo ha ga-adịkwa ukwu.
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
Ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
" ‘ "Onyenwe anyị gọzie unu
ma chebe unu,
Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu,
ma meere unu amara,
Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ,
nyekwa unu udo." ’