Dívidas
As dívidas podem escravizar, mas a Bíblia nos ensina princípios de sabedoria financeira: não se endividar imprudentemente, pagar o que se deve e confiar em Deus como provedor.
O devedor é servo do credor
O rico domina sobre o pobre, e o que toma emprestado é servo do que empresta. A Bíblia convida à liberdade financeira.
Dịka ọgaranya si achị ogbenye,
otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ
mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;
ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.
"Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.
Princípios financeiros
Pagai a todos o que lhes é devido. Deus promete que o justo não será desamparado e que a bênção virá sobre os obedientes.
Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.
Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ.
Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,
ma onye ezi omume na-eme amara na-enye ndị ọzọ ihe o nwere.
"Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?
Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.
Gbaghara anyị mmehie anyị,
dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.
Contentamento
Seja o vosso viver sem ganância, contentando-vos com o que tendes. O Senhor é suficiente — não nos desamparará.
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,
"Agaghị m ahapụ gị.
O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ."
Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị dịka o kwere na nkwa. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ego, ị gaghị anọ nʼụkọ! Ị ga-achị ọtụtụ mba, ma ha agaghị achị gị.