Ensinar
Ensinar é mandamento e dom. A Bíblia exorta pais, líderes e mestres a transmitir a verdade divina com fidelidade, paciência e sabedoria para as próximas gerações.
Ensinar a Palavra
Toda Escritura é útil para ensinar. Quem ouve as palavras de Jesus e as pratica é como o homem sábio que construiu sobre a rocha.
Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume: ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
"Onye ọbụla ṅara ntị nʼokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume.
Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.
Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,
maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,
ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,
ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,
ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile
na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.
Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
Instruir as gerações
Ensina a criança nos caminhos de Deus. A geração que não conhece o Senhor perde a herança espiritual da fé.
Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,
ahapụkwala iwu nke nne gị.
Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,
ka ị ghara ichefu ha.
Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
Nʼihi na iwu a bụ oriọna,
Ihe ozizi a bụkwa ìhè,
otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba
bụ ụzọ ezi ndụ,
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,
hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,
ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.
Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,
nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
Emela dịka ndị na-emebi iwu.
Esokwala ụzọ ha.
Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,
nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;
kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;
atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
Leruo ije ụkwụ gị anya,
doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;
si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi;
geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
Aga m eji ilu malite okwu m,
aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,
ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị Onyenwe anyị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel.
Fidelidade no ensino
Quem ensina com fidelidade merece dupla honra. Cuidado com doutrinas falsas — permaneçam na doutrina de Cristo.
Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru, "Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka," hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ, ọzọkwa, "Onye na-arụ ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya."
Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa. Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a.
Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.
Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe. Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, "Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?"
Jisọs zara ha, "Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m. Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke. Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.