Esperar em Deus
Esperar em Deus não é passividade — é confiança ativa no Senhor que age no tempo perfeito. Os que esperam nele não serão confundidos nem envergonhados.
Esperança em Deus
Descanse somente em Deus, ó minha alma, pois dele vem a minha esperança. Ele é rocha e salvação — não serei abalado.
O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa.
Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,
were ndidi chere ya;
echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,
mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.
Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha.
Chere Onyenwe anyị,
debekwa ụzọ ya.
Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;
mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
Ihere agaghị eme
onye ọbụla olileanya ya dị na gị,
ma ihere ga-eme ha
bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.
O Onyenwe anyị, ana m eche gị;
o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Confiança na espera
O Senhor é bom para os que esperam nele. O olho não viu o que Deus preparou para os que o amam e o aguardam.
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,
nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya.
Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,
bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.
Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,
ọ dịbeghị ntị ghọtara,
o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,
onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
A sịkwala, "Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a."
Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi.
Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa.