O Espírito Santo
O Espírito Santo é a terceira pessoa da Trindade — Consolador, Mestre e Poder. Ele convence do pecado, guia em toda verdade, distribui dons e produz frutos na vida do cristão.
O Consolador prometido
Jesus prometeu enviar o Consolador — o Espírito da Verdade — que estaria para sempre com os discípulos e os guiaria em toda verdade.
Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi.
Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu. Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu. Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m."
Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, "Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?"
Jisọs zara sị ya, "Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri. Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.
"Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ. Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.
"Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m.
Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe,
Ma Jisọs sịrị, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke.
Ma Jisọs sịrị, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, o nweghị ike ịba nʼalaeze Chineke. Ihe e si nʼanụ ahụ mụọ bụ anụ ahụ, ma ihe a mụrụ site na Mmụọ bụ mmụọ. Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’
Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’
O derramamento do Espírito
No Pentecostes, o Espírito desceu como fogo sobre os discípulos. Desde então, todos os que creem recebem o Espírito.
Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe. Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe.
Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
Ma Pita sịrị ha, "Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
Ma Pita sịrị ha, "Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ."
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ."
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama."
Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, "Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha."
Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma.
Dons do Espírito
A cada um é concedida a manifestação do Espírito para o bem de todos. Os dons são diversos, mas o Espírito é o mesmo.
Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile. Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ. Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. Onye ọzọ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a niile. Ọ na-enye onye ọbụla onyinye dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ si kpebie.
Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, "Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ." Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na "Jisọs bụ Onyenwe anyị," ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ.
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?
Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.
Fruto do Espírito
O fruto do Espírito é amor, alegria, paz, paciência, bondade, fidelidade, mansidão e domínio próprio.
Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
Olileanya na-eme ka anyị guzo chịm, nʼihi na Chineke awụnyela ịhụnanya ya nʼime obi anyị site nʼonyinye Mmụọ Nsọ.
Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ.
Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
Não entristeçais o Espírito
Não entristeçais o Espírito Santo de Deus. Não apaguem o Espírito — antes, enchei-vos dele continuamente.
Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.
Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.
Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,
Achụpụla m nʼihu gị,
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
O Espírito nos capacita
O Espírito intercede por nós, batiza e capacita para o serviço. Ele é poder para a missão e conforto na aflição.
Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.
Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ. Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi.
Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
"Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha."
Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge."
Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.
Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, "Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma."
"Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na o teela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ,
ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì,
ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
"Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na o teela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ,
ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì,
ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara."
Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya."