Espírito
O espírito humano é a parte mais profunda do nosso ser — onde Deus habita, onde a fé se ancora e de onde brota a verdadeira adoração. A Bíblia nos chama a viver pelo Espírito.
A natureza do espírito
O espírito está pronto, mas a carne é fraca. A batalha entre carne e espírito é constante e exige vigilância.
Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike."
"Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ,
nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.
Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo.
O Espírito de Deus em nós
Vosso corpo é templo do Espírito Santo. Deus fortalece com poder no homem interior pelo seu Espírito.
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.
Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere, jirikwa uche kpee ekpere. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ, jirikwa uche m bụọ abụ.
Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu; ka Kraịst nwee ike biri nʼobi unu site nʼokwukwe, ka unu ndị gbanyere mgbọrọgwụ guzosiekwa ike nʼịhụnanya.
Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ,
Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ "Abba, Nna." Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke.
Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke.
Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ "Abba, Nna."
Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nʼime unu, anụ ahụ unu ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị, ma mmụọ unu dị ndụ nʼihi na a gụọla unu na ndị ezi omume.
Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.
Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.
Vida no Espírito
Deus é Espírito e importa que os que o adoram o adorem em espírito e em verdade. O Espírito vivifica e transforma.
Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu."
Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya. Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu."
Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.
Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
Promessas do Espírito
Derramarei o meu Espírito sobre toda a carne. O Espírito revela, guia e capacita os filhos de Deus.
Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,
aga m emekwa ka unu mara okwu m.
Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,
ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.
Nganga na-eweta ịla nʼiyi,
mpako na-ewetakwa ọdịda.
Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,
na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.
Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.
Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya,
ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
Ọ sịrị m, "Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,
ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,
na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.
Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ. Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.
Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ.
Cuidar do espírito
Cria em mim um coração puro e renova dentro de mim um espírito reto. O espírito quebrantado Deus não rejeita.
Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,
nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Achụpụla m nʼihu gị,
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,
O Chineke, ị naghị elefu anya,
nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Atụkwasịla ụmụ eze obi gị,
ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.
Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja;
nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.
Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.
Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.
O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya.
Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya."
Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ.
Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,
tupu ite adawaa nʼisi iyi,
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.
Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;
mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.
Lee ka ihe ịrịbama ya,
na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu!
Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi;
ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.