Homem de Deus
O homem de Deus é aquele que busca a justiça, a piedade, a fé e o amor. A Bíblia apresenta modelos de homens íntegros que andaram com Deus e marcaram a história.
Características do homem de Deus
O homem de Deus foge das paixões e segue a justiça, a piedade, a fé, o amor, a perseverança e a mansidão.
Ndụmọdụ mmechi Pọl dụrụ Timoti
Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.
Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.
Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.
Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,
Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,
na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
Exemplos bíblicos
Noé era justo e íntegro entre seus contemporâneos. Jó era homem reto que temia a Deus e se desviava do mal.
Noa na uju mmiri
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya.
Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
Okwu mmalite
Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz. Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ.
Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere.
Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,
ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
Viver como filho de Deus
Quem faz a vontade de Deus é eleito. Medite na Palavra e ande nos caminhos do Senhor como verdadeiro discípulo.
Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?
Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.
Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,
igbochi m imehie imegide gị.
Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị;
kuziere m iwu gị niile.
Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa
iwu niile nke si nʼọnụ gị.
Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile
dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.
Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị
na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
Iwu gị na-amasị m;
agaghị m elefu okwu gị anya.
ג Gimel
Onye ihe na-agara nke ọma
Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ,
onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu;
onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie
maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ.
Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị.
Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,
nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.
Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.
Ha dị ka igbugbo ọka
nke oke ifufe na-efesasị.
Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;
ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.
Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.
Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.