Honrar os pais
Honrar pai e mãe é mandamento de Deus com promessa de vida longa e feliz. A Bíblia ensina que respeitar, obedecer e cuidar dos pais é dever sagrado dos filhos.
O mandamento com promessa
Honra a teu pai e a tua mãe para que vá bem contigo e vivas muito tempo sobre a terra. É o primeiro mandamento com promessa.
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
"Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
Obedecer e respeitar
Filhos, obedecei a vossos pais no Senhor. Ouvir a instrução do pai e não desprezar o ensino da mãe traz sabedoria.
Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Amamihe Kachasị ihe niile
Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,
lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
Okwu nke iri na asaa
Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị,
akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
Ọ zara ha sị, "Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’
Ọ zara ha sị, "Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’ Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’ Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu.
Consequências da desonra
A Bíblia adverte severamente contra a desonra aos pais. Quem amaldiçoa ou agride os pais enfrenta consequências sérias.
Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya
ka Chineke na-afụnyụ.
"Onye ahụ na-akwa nna ya emo,
nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị,
ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya,
udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
"Aghaghị ime ka onye ọbụla ga-akpọ nna ya maọbụ nne ya iyi nwụọ.
Oge ikpeazụ
Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ. Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.
Cuidar dos pais
Quem não cuida dos seus, principalmente de sua família, negou a fé. Honrar os pais inclui respeitar os idosos.
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.
Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.
" ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
" ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.