Marido e mulher
O casamento é aliança sagrada entre marido e mulher, instituída por Deus desde o Éden. A Bíblia define papéis complementares fundados em amor, respeito e fidelidade mútua.
Instituição divina
Deus criou homem e mulher e os uniu em uma só carne. O casamento é projeto divino que reflete o amor de Cristo pela Igreja.
Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya,
nʼoyiyi Chineke ka o kere ha,
nwoke na nwanyị ka o kere ha.
Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, "Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya."
Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Ọ zara ha sị, "Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị. Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya."
Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
Papéis no casamento
O marido ama e a mulher respeita. Ambos se submetem voluntariamente a Deus e um ao outro, em parceria e unidade.
Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.
Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile.
Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
Okwu dịrị ezinaụlọ ndị nke Kraịst
Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.
Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.
Di na nwunye
Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla, mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.
Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
Fidelidade e união
O casamento é honroso e deve ser preservado com fidelidade. O cordão de três dobras não se rompe facilmente.
Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,
nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
Otu onye nʼime ha daa,
onye nke ọzọ ga-apalite ya.
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya?
Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,
ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.
Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,
ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
ka ara dị ya nʼobi zuore gị,
ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
Permanecer juntos
O que Deus uniu, o homem não separe. A Bíblia protege o casamento e orienta sobre convivência, perdão e perseverança conjugal.
Ajụjụ banyere ọlụlụ dị na nwunye
Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: "Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka." Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya. Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya. Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya. A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo. Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye.
Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.