Pular para o conteúdo
Publicidade

Materialismo

Por Bíblia Online

O materialismo é uma armadilha espiritual. A Bíblia alerta que o amor ao dinheiro é raiz de todos os males e nos chama a buscar tesouros no céu, não na terra.

O perigo das riquezas

Que aproveita ao homem ganhar o mundo inteiro e perder a sua alma? O materialismo engana e afasta do que realmente importa.

Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?

Uru gịnị ka ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha?

Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.

Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. Ya mere, bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere.

Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. Ya mere, bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere.

Tesouros no céu

Ajuntai tesouros no céu, onde traça e ferrugem não consomem. O bom nome vale mais que muitas riquezas, e a sabedoria supera o ouro.

Ịkpado akụ nʼeluigwe

"Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha. Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.

Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

Jisọs zara sị ya, "bụrụ na chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m."

Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ,

ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.

ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe

karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.

dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị,

karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu.

Contentamento e generosidade

Grande ganho é a piedade com contentamento. A cobiça é idolatria, mas a generosidade traz alegria e bênção.

Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere.

Ndị ọgaranya

Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.

Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,

"Agaghị m ahapụ gị.

O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ."

Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).

Ma sịrị ha, "Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere."

Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, gaghị eju ya afọ.

Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla.

Nke a bụkwa ihe efu.

Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa,

otu a ka anyị ga-esi hapụ ya.

O nweghị ihe ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile

dọgburu onwe ya nʼọrụ.

O invisível acima do visível

As coisas que se veem são temporais; as que não se veem são eternas. Devemos fixar os olhos no que é permanente e verdadeiro.

Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,

bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.

Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;

bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.

Nʼihi na akụ nwere ike ifu

nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị

na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.

Kwa ụbọchị ka na-achọ inwe karịa,

ma onye ezi omume na-enye na-akpaghị oke.

Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.

Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,

kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.

Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. bụghị isi a kpara akpa, ma bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi. Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke.

Ndị kwere ekwe na-ekekọrịta ihe

Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.

Seja o primeiro