Publicidade

Misericórdia

Por Bíblia Online

A misericórdia de Deus é eterna e inesgotável. Ele se compadece dos que sofrem, perdoa os arrependidos e derrama graça sobre os que não merecem. Grande é a sua fidelidade.

A misericórdia de Deus

Quem é Deus como tu, que perdoa a iniquidade? Ele se deleita em ter misericórdia e não retém a ira para sempre.

Onye bụ chi ahụ dịka gị,

nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie

nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?

Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,

kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.

O Chineke, meere m ebere,

nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide;

nʼihi oke ọmịiko gị,

hichapụ njehie m niile.

Sachapụ mmehie m niile,

ma mee m ka m dị ọcha.

Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,

nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.

Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,

ya na nnupu isi m niile.

Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,

Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.

O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa.

Onyenwe anyị, nụrụ olu m.

Ka ntị gị na-aṅakwa ntị

nʼolu arịrịọ m, maka amara.

O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,

ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.

Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,

otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,

Graça e perdão

Onde o pecado abundou, superabundou a graça. Deus convida todos ao arrependimento e promete perdão total aos que confessam.

Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ.

Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị.

Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.

Ma ọ sịrị m, "Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike." Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m.

Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.

Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.

Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,

ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.

Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,

ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.

Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,

ka o gosi unu ịhụnanya ya.

O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.

Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.

Misericórdia e compaixão

Misericórdia quero e não sacrifício. Deus nos chama a ser misericordiosos como Ele é, perdoando e acolhendo o próximo.

Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie."

Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, "Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?"

Jisọs zara sị ya, "Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa.

Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.

Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.

Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe,

onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile.

Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị;

mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike,

e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.

Acessar a misericórdia

Cheguemos com confiança ao trono da graça. Ali encontramos misericórdia e graça para socorro no tempo oportuno.

Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.

Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere Chineke na-arịọ ka unu chee anụ ahụ unu dịka aja dị ndụ, dịkwa nsọ, ma bụrụkwa nke na-atọ Chineke ụtọ, nke bụkwa ofufe nke ime mmụọ unu.

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.

Mmemme Ngabiga

Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ. Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem. Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a. Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.

Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si:

"Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị. Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya. Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ. Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya."

Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo. Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem. Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.

Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko. Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.

Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, "Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị." Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.

Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.

Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.

Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ. Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ. Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa. Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem. Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.

"Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m,

nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ,

di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ?

Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu?

Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko,

ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?"

otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a,

olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko?

Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko,

na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara.

Ị werela ịkwa iko gị niile

na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.

Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu,

ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị.

Nʼihi na unu bụ ndị akwụna,

ndị ihere na-adịghị eme.

Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m,

‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.

Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile?

Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’

Otu a ka unu si ekwu okwu,

ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime."

Ekwesighị ntụkwasị obi Izrel

Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. "Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ. Echere m na mgbe o mesịrị ihe ndị a niile na ọ ga-alọghachikwute m, ma ọ lọtaghị. Nwanne ya nwanyị bụ Juda, onye na-ekwesighị ntụkwasị obi hụkwara ya. Enyere m Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi akwụkwọ alụkwaghị m, chụpụ ya nʼihi ndụ ịkwa iko ya, ma lee na nwanne ya nwanyị onye na-ekwesịkwaghị ntụkwasị obi bụ Juda atụghị egwu. Ọ gakwara nʼihu ịkwa iko. Ma nke a emeghị ka ihere mee ya. O merụọla ala, ọ na-akwakwa iko site nʼife nkume na osisi. Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ," otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, "Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ. Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị,

" ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ,

nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,

‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.

Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara,

na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị.

Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche

nʼokpuru osisi ndụ niile,

na ị jụkwara irubere m isi.’ "

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

"Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi," ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, "nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn. Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu. Nʼụbọchị ahụ, mgbe ọnụọgụgụ unu mụbara dị ukwuu nʼala ahụ," otu ka Onyenwe anyị kwubiri ya, "ndị mmadụ agaghị asịkwa ọzọ, ‘igbe ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị.’ Ọ gaghị abakwa ha nʼobi maọbụ ha echeta ya; ọ gaghị adịkwa ha mkpa maọbụ emepụtakwa ọzọ. Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha. Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa."

"Mụ onwe m kwuru sị,

" ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom,

nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ,

nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’

Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’

ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.

Ma dịka nwunye na-ekwesighị ntụkwasị obi,

i gosila onwe gị, O Izrel na ị bụ onye a na-ekwesighị ịtụkwasị obi"

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

A na-anụ ụzụ mkpu akwa nʼelu ugwu.

Ọ bụ ụzụ akwa ụmụ Izrel ndị na-arịọ arịrịọ

nʼihi na ha ebiela ndụ mmehie;

ha echefuokwala Onyenwe anyị bụ Chineke ha.

"Lọghachinụ, unu bụ ndị na-adaghachi azụ.

Mụ onwe m ga-agwọ unu ndaghachi azụ unu."

Ma unu na-aza sị, "E, anyị na-alọghachikwute gị

nʼihi na gị onwe gị bụ Onyenwe anyị Chineke anyị.

Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile,

nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ,

nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị

ka nzọpụta Izrel dị.

Ma site mgbe anyị dị na nwantakịrị, ihe ihere ahụ eripịala

mkpụrụ sitere na ndọgbu nʼọrụ nke nna nna anyị ha

igwe anụ ụlọ na ehi ha,

ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.

Ka anyị dinara ala nʼihere anyị,

ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị.

Anyị na nna nna anyị ha

emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị;

site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa

o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu."

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-19_11-20-24-