Pular para o conteúdo
Publicidade

A mulher sábia

Por Bíblia Online

A mulher sábia constrói sua casa sobre o fundamento do temor do Senhor. Sua sabedoria abençoa a família, a comunidade e as gerações futuras.

A sabedoria que edifica

A mulher sábia edifica sua casa. O temor do Senhor é o princípio da sabedoria e a instrução que conduz à honra.

Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,

ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.

Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,

inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;

onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.

bụrụ na dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.

Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,

chọọnụ ihu ya mgbe niile.

Virtude e excelência

A mulher virtuosa é coroada de força e dignidade. Ela abre a boca com sabedoria e a instrução da bondade está na sua língua.

Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya?

dị oke ọnụ karịa nkume rubi.

bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.

Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.

na-eji amamihe na-ekwu okwu

ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.

Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;

otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.

ga-asị; "E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha,

ma gị onwe gị kachasị ha niile mma."

Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.

Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,

ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.

Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,

ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.

Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,

ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.

Exemplo e influência

A mulher sábia é exemplo de fé e bom testemunho. Suas atitudes inspiram e seu legado abençoa as gerações que virão.

Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma. Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya. Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.

Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.

Ụmụ agbọghọ iri

"A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.

"Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!

"Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.

"Ndị maara ihe zara ha sị, Mba! gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.

"Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.

"Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!

"Ma zaghachiri ha sị, Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.

"Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.

Seja o primeiro