Namoro e sexo
Namoro e sexo são temas que a Bíblia trata com clareza e sem tabus. Deus criou o sexo como bênção dentro do casamento e nos chama à pureza fora dele.
Pureza sexual
A vontade de Deus é a santificação. Cada um saiba controlar seu próprio corpo em santidade e honra, não na paixão do desejo.
Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko, ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.
Unu na-asị, "E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri." Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.
Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
Arrependimento e restauração
Bem-aventurado aquele cujo pecado é perdoado. Deus restaura os que se arrependem e cria neles um coração limpo e renovado.
Nkwupụta na mgbaghara mmehie
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,
onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,
onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,
onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
Mgbe m gbachiri nkịtị,
ọkpụkpụ m rere ure
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela
Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
"Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị."
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha.
Sachapụ mmehie m niile,
ma mee m ka m dị ọcha.
Nʼihi na amaara m njehie m niile,
mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,
mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,
nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,
na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha;
sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;
ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,
hichapụkwa mmehie m niile.
Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,
nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Achụpụla m nʼihu gị,
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
ma jiri ezi mmụọ kwagide m.