Pular para o conteúdo
Publicidade

Palavras de conforto

Por Bíblia Online

Deus é o Deus de todo conforto. Ele consola os que choram, restaura os quebrantados e promete que a dor presente dará lugar à alegria eterna.

O Deus de toda consolação

Bendito seja o Deus e Pai de nosso Senhor Jesus Cristo, Pai das misericórdias e Deus de toda consolação, que nos consola em todas as tribulações.

Ekele dịrị Chineke onye nkasiobi

Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.

Ekele dịrị Chineke onye nkasiobi

Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke. Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst. Ma bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.

Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst.

Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya

maọbụ kwaa ya emo;

o lefughị ya anya

kama mgbe kpọkuru ya, nụrụ olu akwa ya.

Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,

na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.

Promessas de restauração

Deus sarará o quebrantado de coração e atará as suas feridas. Quem semeia em lágrimas, colherá com júbilo.

na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa

na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.

Iwe ya adịghị adịgide tee anya,

ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!

Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,

ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

ga-agba gị ume;

gaghị ekwe

ka ewezuga onye ezi omume.

Depụta akwa arịrị m;

chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.

bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?

Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.

bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.

Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.

bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.

Paz e descanso

Jesus disse: 'Vinde a mim, todos os cansados e sobrecarregados, e eu vos aliviarei.' A paz de Deus que excede todo entendimento guarda o coração.

"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.

"Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.

Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ,

nʼihi na a ga-akasị ha obi.

Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

"Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa."

Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu.

Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.

Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

Esperança eterna

Deus enxugará toda lágrima. A dor presente é momentânea, mas a glória futura é eterna. O Senhor transforma luto em dança.

Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, "Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala."

Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, "Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ." Mgbe ahụ, sịkwara, "Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu."

Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ.

Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.

Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.

Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;

aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.

Afọ ngosi ihuọma Onyenwe anyị

Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,

nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ

ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.

O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,

ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,

na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.

O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ,

na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị.

O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi,

na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha.

O zitere m inye ha okpueze mara mma

nʼọnọdụ ntụ,

inye ha ọṅụ,

nʼọnọdụ ịkwa akwa,

na iyikwasị ha mmụọ otuto

nʼọnọdụ mmụọ ịda mba.

Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha,

dịka osisi ook siri ike,

igosi ịma mma Onyenwe anyị.

Dịka nne si akasị nwa ya obi,

otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.

bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi."

Nunca sozinhos

Deus nunca nos abandona. Ele está ao nosso lado em cada vale, segura nossa mão e promete que o choro não durará para sempre.

Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ga-anọnyekwara gị, gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba."

Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola,

"Agaghị m ahapụ gị.

O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ."

Onyenwe anyị dị mma.

bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.

na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,

bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.

ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;

nʼihi ịhụnanya ya, gaghị abakwara gị mba,

kama ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe nọ."

Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Ya mere, bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.

Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, nyefeenụ onwe unu nʼaka onye okike, onye kwesiri ntụkwasị obi, ma nọgidenụ na-eme ezi ihe.

Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya. Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.

A sịkwarị na m na-aga ije,

na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,

agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;

nʼihi na nọnyeere m,

mkpọrọ gị na mkpanaka gị

na-akasị m obi.

Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,

nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;

ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị

ụbọchị niile nke ndụ m,

na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,

na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.

Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,

ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;

ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;

ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.

Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:

nkwa gị na-echebe ndụ m.

na-ebuli ndị dị ala elu,

na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha.

Jisọs sịrị, "Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke hapụrụ. ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.

Aga m arịọ Nna m, ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.

Seja o primeiro