Pão
O pão é símbolo central na Bíblia: do maná no deserto ao pão da vida — Jesus. A Escritura usa o pão para ensinar sobre provisão divina, comunhão e dependência espiritual.
O maná do céu
Deus alimentou Israel no deserto com pão do céu. O maná era diário, fiel e suficiente — retrato da provisão constante de Deus.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, "Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ "
Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile. Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, "Gịnị bụ nke a?"
Mosis zaghachiri ha sị, "Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.
Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu
meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie.
O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi.
O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,
na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,
ime ka nri site nʼala pupụta;
mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,
mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,
na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
O pão da vida
Jesus declarou: 'Eu sou o pão da vida.' Quem vem a Ele nunca terá fome, e quem nele crê jamais terá sede. Ele é o sustento eterno.
Jisọs sịrị ha, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe. Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ."
Ha sịrị ya, "Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa."
Jisọs sịrị ha, "Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
Abụ m achịcha nke ndụ. Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ. Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ. Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa."
E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
Ma Jisọs zara, "E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’."
Partilha e comunhão
O partir do pão une o corpo de Cristo. Na Ceia, na generosidade e na partilha, expressamos a comunhão com Deus e uns com os outros.
O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, "Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m."
Nʼihi na mgbe ọbụla unu na-eri achịcha ahụ na-aṅụkwa iko a, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ.
Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst? Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.
"Sinụ otu a na-ekpe ekpere:
" ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe,
ka e doo aha gị nsọ.
Ka alaeze gị bịa,
ka e mee uche gị nʼụwa,
dịka e si eme ya nʼeluigwe.
Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi,
nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
Ma ọ zara sị ha, "Nyenụ ha ihe ha ga-eri."
Ha sịrị ya, "Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?"
Ma ọ jụrụ ha sị, "Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta."
Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, "Ogbe achịcha ise na azụ abụọ."
Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ. Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. Ha niile riri rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ.
Provisão divina
O justo não é desamparado e seus descendentes não mendigam pão. Deus provê com fidelidade o alimento de cada dia.
Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,
ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,
maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Ihe na-eko achịcha ndị Farisii
Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla. Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, "Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii."
Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla.
Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, "Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha? Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru? Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara? Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ." Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
Ịgbasapụ aka
Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye
nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.
Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ
nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.