Pular para o conteúdo
Publicidade

O papel da mulher

Por Bíblia Online

A Bíblia honra a mulher como colaboradora essencial no plano de Deus. De Provérbios 31 às mulheres do Novo Testamento, a Escritura celebra a sabedoria, a força e a fé feminina.

A mulher virtuosa

Mulher virtuosa, quem a achará? Seu valor excede o de rubis. Ela é sábia, trabalhadora, generosa e temida pelo Senhor.

Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya?

dị oke ọnụ karịa nkume rubi.

Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,

dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.

Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.

Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

na-ahọrọ ajị anụ na flakisi

jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.

na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya

dịka a ga-asị na bụ ụgbọ mmiri.

Tupu chi abọzie,

nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri,

ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.

na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.

bụ ego rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.

Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.

dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.

na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;

bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.

Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;

mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.

na-agbasapụ aka

inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.

na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,

ndị na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.

bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.

Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.

na-eji amamihe na-ekwu okwu

ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.

na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,

naghị arụ ọrụ umengwụ.

Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya,

ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya.

Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu

Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị

ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.

Beleza interior

A beleza verdadeira não é exterior, mas o caráter incorruptível de um espírito manso e tranquilo. Isso tem grande valor diante de Deus.

Di na nwunye

Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla, mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ. Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke. Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha. Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.

Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.

Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. bụghị isi a kpara akpa, ma bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi.

Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.

Parceria e dignidade

Deus criou homem e mulher à sua imagem. A mulher não é inferior, mas parceira e co-herdeira da graça da vida.

Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya,

nʼoyiyi Chineke ka o kere ha,

nwoke na nwanyị ka o kere ha.

Chineke gọziri ha sị ha, "Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala."

Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, "dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya."

gwara nwanyị ahụ sị ya,

"Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,

bụ site nʼihe mgbu ka ga-eji mụpụta ụmụ gị.

Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,

bụ ya ga-achịkwa gị."

Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke. Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.

Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile.

Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma. Ha ga-esi otu a kuziere ụmụ agbọghọ ka ha ga-esi hụ di ha na ụmụ ha nʼanya. Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuruoke, ndị dị ọcha nʼobi, ndị na-edozi ezinaụlọ di ha, ndị na-eme ebere, ndị na-edo onwe ha nʼokpuru di ha, ka onye ọbụla ghara ikwulu okwu Chineke.

Seja o primeiro