Proximidade
Deus é próximo dos que o buscam. Ele não é um Deus distante, mas presente, íntimo e acessível a todo o que o invoca com sinceridade de coração.
Buscar a presença de Deus
A Bíblia nos exorta a buscar a face do Senhor continuamente. Quem se aproxima dele encontra plenitude de alegria e delícias perpétuas.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.
Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị,
karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ;
ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m,
karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.
I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Deus está perto
O Senhor está perto dos que o invocam, dos quebrantados de coração e dos que clamam por socorro. Sua presença nos sustenta.
Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.
Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị
mgbe niile ebighị ebi.
A presença que nunca abandona
Deus promete nunca nos deixar. Ele permanece fiel, está conosco em todo tempo e envia o Espírito para habitar em nossos corações.
Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
Ka Onyenwe anyị Chineke anyị dịnyere anyị, dịka o si dịnyere nna nna anyị ha. Ka ọ gharakwa ịhapụ anyị, maọbụ gbakụta anyị azụ.
Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara.
Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nʼaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe niile, nʼime ọnọdụ ọbụla unu nọ nʼime ya. Onyenwe anyị nọnyekwara unu.
Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya.
Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị Azaraya nwa Oded. Ọ pụrụ jekwuru Asa sị ya, "Geenụ m ntị, gị Asa na ndị Juda niile na Benjamin. Onyenwe anyị ga-anọnyere unu oge niile unu na-eme okwu ya. Unu ga-achọta ya mgbe ọbụla unu chọrọ ya. Ma ọ ga-agbakụta unu azụ oge ọbụla unu nupuru isi nʼiwu ya. Ma ọtụtụ oge dị anya ndị Izrel nọ na-enweghị Chineke nke ezie, ha enweghịkwa onye nchụaja ga-ezi ihe, ha enweghịkwa iwu Chineke Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka. Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara. Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha. Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu."
Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa. Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha. Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe. Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye. Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi. Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn. Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.