Redentor
Deus é o nosso Redentor. Ele nos resgatou da escravidão do pecado, nos libertou das cadeias e nos comprou com preço altíssimo — o sangue de seu Filho.
Liberdade em Cristo
Cristo nos libertou para a liberdade. Aquele a quem o Filho liberta é verdadeiramente livre. O Redentor quebra toda cadeia.
Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
Inwe onwe anyị nʼime Kraịst
Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.
Afọ ngosi ihuọma Onyenwe anyị
Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,
ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,
na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.
Ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ
Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst. Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.
Redenção e salvação
Deus nos redimiu por amor. Ele apagou nossas transgressões e nos salvou não por mérito nosso, mas por sua misericórdia.
Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii,
hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ.
Lọghachikwute m,
nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị."
Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha."
Ọ bụ ya jiri onwe ya chụọ aja nʼihi anyị, ka ọ gbapụta anyị site nʼajọ omume anyị niile, na ido ndị ga-abụ ndị nke ya ọcha nye onwe ya, ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.
Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.
Refúgio e proteção
O Redentor é nosso refúgio e fortaleza. Ele livra os que clamam, sara os quebrantados e se alegra por nós com cântico.
Abụ mmeri
O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.
Oge m dị gị nʼaka
Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;
ekwela ka ihere mee m;
site nʼezi omume gị gbapụta m.
Oge m niile dị gị nʼaka.
Napụta m nʼaka ndị iro m
na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu,
ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile.
Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,
nʼihi ebube nke aha gị;
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile
nʼihi aha gị.
Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ
mgbe m na-abụku gị abụ otuto,
mụ, onye ị gbapụtara.
Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,
nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi
ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.
O Onyenwe anyị, zọpụta m
site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha
na ire na-ekwu okwu aghụghọ.
Vestidos de salvação
O Redentor nos veste com roupas de salvação e manto de justiça. Ele se alegra por nós e nos cobre com seu amor.
Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị,
mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m.
Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m,
werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ.
Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja.
E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ."