Repouso e férias
Deus criou o descanso como parte da vida. O sábado, o repouso e até as férias refletem a confiança de que Deus sustenta todas as coisas — mesmo quando paramos.
O descanso como ordenança
Deus descansou no sétimo dia e nos convidou a fazer o mesmo. O descanso sabático é um presente de Deus para restauração do corpo e da alma.
Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke. Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.
"Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,
sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,
ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasị
na ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu,
ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,
na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,
mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị,
m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ,
meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb."
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
Sono e paz
Ditar-se em paz e dormir tranquilamente é bênção do Senhor. Quem confia nele dorme sem medo e acorda renovado.
Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,
nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,
na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.
Edinara m ala, hie ụra,
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ
na-adọgbu onwe gị nʼọrụ
ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị,
nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.
Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,
maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,
Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu,
ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma,
ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu,
ma oke iriju afọ onye ọgaranya
anaghị ekwe ya rahụ ụra.
Descanso e segurança
No repouso, encontramos segurança. Deus guarda os justos, e mesmo no silêncio da noite, sua paz nos protege e restaura.
Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;
ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,
ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.
Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha
na-abanye nʼudo.
Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.