O Senhor é o meu pastor
O Salmo 23 é a expressão máxima da confiança em Deus como Pastor. Jesus se declarou o Bom Pastor que conhece suas ovelhas, cuida delas e dá a própria vida por elas.
O Senhor é o meu Pastor
Davi declarou com confiança que o Senhor é seu pastor e nada lhe faltará. Ele nos guia, nos restaura e nos conduz em caminhos de justiça.
Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ
Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ
Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya.
Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;
buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
O Bom Pastor
Jesus é o Bom Pastor que conhece suas ovelhas pelo nome. Ele dá a vida por elas, as protege e nenhuma pode ser arrebatada de sua mão.
"Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
"Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya.
Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a, e meela ka unu laghachikwute Onye ahụ na-azụ unu dị ka atụrụ, na Onye na-elekọtakwa mkpụrụobi unu anya.
Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.
O cuidado pastoral de Deus
Como pastor terno e forte, Deus carrega os cordeiros nos braços e guia com cuidado as ovelhas que amamentam.
Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike,
ike aka ya ka o ji achị.
Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,
ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ.
Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.