Sobre ter filhos
Filhos são uma dádiva do Senhor, uma herança que Deus confia aos pais. A Bíblia celebra a maternidade e a paternidade como vocações sagradas e fontes de bênção.
Filhos: herança do Senhor
A Escritura declara que os filhos são bênção de Deus. Cada criança é um presente precioso confiado aos pais para ser cuidado com amor.
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha,
otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ
onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya.
Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro
na-arụrịta ụka nʼama.
Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị
na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;
ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv
gburugburu tebul gị.
Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya
dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi.
Toonu Onyenwe anyị.
Chineke gọziri ha sị ha, "Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala."
Instruir nos caminhos de Deus
A Bíblia orienta os pais a instruir seus filhos nos caminhos do Senhor desde cedo, com dedicação, disciplina e exemplo.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ.
Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
Cada vida é preciosa
Deus conhece e forma cada criança no ventre. Antes de nascer, Ele já nos separou e preparou um propósito para cada vida.
"Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị,
tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ,
ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile."
Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,
mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
Ma Jisọs sịrị ha, "Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a."