Publicidade

Verdade

Por Bíblia Online

A verdade é um dos atributos centrais de Deus e um pilar da vida cristã. Jesus se declarou o caminho, a verdade e a vida. Viver na verdade é viver em liberdade e integridade.

Deus é a fonte da verdade

O Senhor é fiel e verdadeiro em todas as suas palavras. Sua Palavra é a verdade absoluta que ilumina nosso caminho e nos sustenta.

Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma bụghị site na m.

Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.

Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;

o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.

"Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,

bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.

O Espírito da verdade

Jesus prometeu enviar o Espírito Santo, o Espírito da verdade, que nos guia, ensina e nos faz lembrar de tudo o que Cristo disse.

Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.

Ọrụ Mmụọ nsọ na-arụ

"Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ga-agba ama banyere m.

Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.

Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu."

A verdade liberta

Jesus prometeu que conhecer a verdade nos torna livres. A mentira aprisiona, mas a verdade de Deus nos conduz à plenitude.

Ụmụ nke Ebraham

Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, "bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m. Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu."

Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi;

e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.

Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,

nʼihi na bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,

olileanya m dị na gị.

Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.

Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.

Vivendo e falando a verdade

Somos chamados a falar a verdade em amor e a rejeitar toda forma de engano. A integridade nas palavras é marca do cristão.

Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst.

Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya.

Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta,

onye na-arụ ọrụ ezi omume,

onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.

Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ,

onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ,

na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,

chezie ire gị ka ghara ikwu ihe ọjọọ,

chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka gharakwa ịgha ụgha.

Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,

ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.

Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;

kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.

Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka "E" unu bụrụ "E." Ka "E e," unu bụrụkwa "E e." Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma.

Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.

Ya mere bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị.

O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.

Okwukwe

Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-