Vitória
A vitória do cristão não depende de suas próprias forças, mas do poder de Deus que opera em nós. As Escrituras declaram que somos mais que vencedores por meio daquele que nos amou.
A vitória vem de Deus
O Senhor luta por nós. Quando confiamos nele, nenhuma arma forjada contra nós prosperará e nenhum inimigo prevalecerá.
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-eso unu gaa, ọ ga-alụrụ unu ọgụ imegide ndị iro unu, ọ ga-enyekwa unu mmeri."
Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, "Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu."
E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha,
maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.
Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
ha emerighị site nʼike nke aka ha;
ọ bụ aka nri gị, aka gị,
na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
Ị bụ eze m na Chineke m,
onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
Mais que vencedores
Em todas as circunstâncias, a fé nos dá a vitória. O mundo tenta nos derrubar, mas Cristo já venceu o mundo e nos faz triunfar.
Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?
"Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị?
Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?"
Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Força para a batalha
Deus nos reveste com sua armadura espiritual, nos fortalece e nos encoraja. Mesmo que o justo caia sete vezes, ele se levanta.
Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.
Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ.
Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri,
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,
iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,
ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.