13 Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl? 14 Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs. 15 Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m. 16 (Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.) 17 Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.
Publicidade