27 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha Onyenwe anyị maọbụ ṅụọ iko Onyenwe anyị nʼụzọ na-ekwesighị ekwesi, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Onyenwe anyị na ọbara Onyenwe anyị. 28 Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọbụla nyochaa onwe ya nke ọma tupu o rie achịcha ahụ maọbụ ṅụọ iko ahụ. 29 Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.
Publicidade