Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Ndị Kọrint 12:1-7

Onyinye Mmụọ Nsọ na-enye

1 Ugbu a ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe gbasara onyinye nke Mmụọ Nsọ na-enye. 2 Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi. 3 Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, "Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ." Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na "Jisọs bụ Onyenwe anyị," ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ.

4 Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile. 5 E nwekwara ụdị ije ozi dị iche iche, maọbụ otu Onyenwe anyị ahụ ka a na-ejere ozi. 6 Ụdị ike dị iche iche nke eji arụ ọrụ dịkwa, ma otu Chineke ahụ na-etinye ike ndị a nʼime onye ọbụla iji jee ozi.

7 Ọ na-enyekwa onye ọbụla amara izipụta ike nke Mmụọ Nsọ maka ọdịmma mmadụ niile.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.