11 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke. 12 Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị. 13 Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.
Publicidade