15 Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.
Ụlọnsọ Chineke
16 Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu? 17 Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. Nʼihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.