Mmehie ịkwa iko
12 Ị na-asị, "Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime," ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. "Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi," ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m. 13 Unu na-asị, "E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri." Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị.