Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Coríntios 7

3 Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. 4 Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama bụ nwunye ya na-achị ya. 5 Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

Veja também