34 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
35 Tikuonụ ya mkpu sị, "Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele;
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị."
36 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, "Amen" na "Toonu Onyenwe anyị."