11 Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike,
na ịma mma, na ugwu eze, na ebube,
nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị.
Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe alaeze.
Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile.
12 Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa.
Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile.
Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị
ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
14 "Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị. 15 Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.