Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Pedro 1

22 Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe dị ukwuu. 23 Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. 24 Nʼihi na,

"Mmadụ niile dị ka ahịhịa,

ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa,

ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,

25 ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi."1:25 Aịz 40:6-8

Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.

Veja também