Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Pedro 5

2 na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. 3 Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ. 4 Ma mgbe Onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-abịa unu ga-anata okpueze ebube nke na-agaghị agbanwe agbanwe.

5 Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na,

"Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu,

ma na-enye ndị dị umeala nʼobi amara."5:5 Ilu 3:34

Veja também